Friday, December 18, 2009

ELU IGWE------- The sky


Akuko gi nke ubochi taa magburu onwe ya. Achoro m i zaghachi n'asusu igbo. Elu -igwe di egwu. Mgbe madu di na nwata, ana m eche n'elu igwe n'emetu ala n'ebe tere aka site n'ebe madu noo. O n'adi ka madu gawa, n'onwere mgbe o'geru ebe elu igwe meturu ala .Ma mgbe madu jegidere ije rue ihe dika nmiri/ iyi, ebe o dicha ka igwe o n'emetu ala, ahu kwa n'elu igwe emutughi ala cha cha. Mgbe ufodu, aluluu (clouds) n'agaghari n'elu igwe, udiri di iche iche, nke nnukwu abia nmiri n'eji oji dika unyi, nke n'adi ka anwuru oku di kwa, na ndi n'adi ka uzu n'esi na nmiri oku aputa. Ihe nile ndi a n'eme m ka mu tugharia uche nke ukwu gbasara ihe di n'azu elu igwe. Uche m n'gwam otutu ihe di iche iche gbasra elu igwe. Anyanwu bi n'elu igwe, onwa bikwa n'elu igwe, kpakpa-ndo, udiri di iche-iche bi n'elu igwe. Ikuku n'esi n'elu igwe abia, nmiri ozuzo n'esi n'elu igwe abia. Nwoke ji onyike atuwa nku, bikwa n'onwa di n'elu igwe. Onwa tiwe, o n'adi egwu n'ogbe. Umu aka n'eje ozi mgbede ha ososo, ka nne na nna ha were kwere ha puo jee/gaa soro umu aka ndi ozo wee zute onwa, ma gwukwaa egwu onwa. Udiri egwu di iche-iche ka umu aka n'eji egwuri egwu onwa. Onwa ohuru puta, umu aka agbaputa n'ele anya n'elu igwe n'aguru onwa egwu di otua------

Onwa nnoo, nnoo,
nnoo, onwa nnoo,
Mu weta jii, mu na gi erie,
Mu weta ede, mu na gi erie,
Mu weta ona, mu na gi erie,
Onwa nnoo, onwa nnoooo
Ha n'agu egwu a, ha n'ele anya n'elu igwe, n'agba okirikiri, rue mgbe aju buturu ha n'ala, ha adaa dika ndi nmanya n'egbu. Nime abali ole na ole, onwa ahu habu ka ntakiri ibe oroma ebuola dika eletrik Chukwu kwunyere n'elu igwe k'umu uwa jiri nwere obi uto.
Umu aka n'enweju obi anuri afo. Ha n'agba bolu, kpoo oga, gbaa mgba, gbaa kwaa egwu di iche iche dika ----
akpakoro, kpakoro,
udu moo, ogene,
Okuko oo o bia oo
onye o mara,
Suu yagha yagha yaa
Suu ya.
Ha daa n'ala n'anya aju. Onye o mara , bu/wu onye kpechaa azu daa n'ala, eburu ya tufuo na'kuku.

Uma aka n'ewere kwa onwa jee ozi di iche-iche. Ndi oshi na ndi nto ejughi e be nile n'oge ahu, ndi madu n'enwe ike jiri onwa jee iyi/ nmiri ikute nmiri na abali ma n'uzo ututu. Anakpo ya igba uzo nmiri. Ebe nile n'ada juu na nmiri n'uzo ututu, ihe dika elekere ise, nmiri anegbuke dika enyo, elu igwe adika nnukwu oku Chukwu chedoro umu ya ka ha jiri huu uzo. Umuaka n'ayikoso onu wee gbaa uzo nmiri maka egwu i hu ndi nmuo n'uzo nmiri. Onwere ebe a n'eli ozu madu n'agafe were n'agba uzo nmiri, oso k'aneji agbafe maka egwu ndi nmuo. Madu n'agba, o dika o g'eru ebe elu igwe n'emetu ala. Ma na elu igwe anaghi emetu ala cha-cha. Otu aka ahu kwa onwa oma ahu di n'elu igwe, n'adi k'ogeru aka i ji ngu kote ya, tumadi mgbe ojuru pim-pim. Ma n'onwebeghi onye kotere ya bu onwa di n'elu igwe. Dika I kwuru, i gba elu igwe nkele okpa bu inyere ndu aka n'ezie. K'anyi jiri kwa otu aka ahu n'agbali kwa ikote onwa ahu di n'elu igwe. Ebe oku nyuru, aghasa owa. Deme kwa maka ozi Krisimesi a. O mere ka mu cheta otutu ihe di nma n'ezie, n'eme ka madu nwee obi uto.
Udo diri gi na ezi n'ulo gi.

Nwada Chinwe Enemchukwu
Onye Uwa Oma
na Orlando, Florida.
- Show quoted text -

__._,_.___

No comments: